Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA | MEE KA OZI ỌMA NA-ATỌKWU GỊ ỤTỌ

Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-akụzi Ihe

Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-akụzi Ihe

Ọ bụrụ na anyị ejiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwu okwu, ọ ga-eme ka ndị mmadụ na-ege anyị ntị. Ọ na-egosikwa na anyị ji ozi ọma anyị na-ezi kpọrọ ihe. N’agbanyeghị agbụrụ anyị si ma ọ bụ ụdị ndị anyị bụ, anyị ga-enweli ịnụ ọkụ n’obi. (Rom 12:11) Olee ihe ga-enyere anyị aka?

Nke mbụ, chee banyere otú ozi ọma ị na-ekwusa si dị mkpa. Ọ bụ ihe ùgwù na i so “na-ezisa ozi ọma nke ihe dị mma.” (Rom 10:15) Nke abụọ, chee banyere uru ozi ọma ị na-ekwusa ga-abara ndị na-ege gị ntị. Ọ dị ezigbo mkpa ka ha nụ ozi ọma ị na-ekwusa. (Rom 10:13, 14) N’ikpeazụ, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwu okwu. Ka ị na-eme ya, na-emegharị ahụ́ gị, ka ihu gị gosikwa otú obi dị gị maka ihe ị na-ekwu.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NA-ENWE ỌṄỤ A NA-ENWE N’IHI IME NDỊ NA-ESO ỤZỌ—NA-EME KA OTÚ I SI EZI OZI ỌMA KA MMA—NA-EJI ỊNỤ ỌKỤ N’OBI AKỤZI IHE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Gịnị mere ka Linda gharazie ijicha ịnụ ọkụ n’obi na-amụrụ Joy ihe?

  • Olee ihe nyeere Linda aka ịmaliteghachi inwe ịnụ ọkụ n’obi?

  • Iji Ịnụ Ọkụ n’Obi Ekwu Okwu Ga-eme Ka E Gee Anyị Ntị

    Gịnị mere anyị kwesịrị iji lekwasị anya n’àgwà ọma ndị na-ege anyị ntị nwere?

  • Olee uru iji ịnụ ọkụ n’obi na-akụzi ihe ga-abara ndị anyị na-amụrụ Baịbụl na ndị ọzọ?