Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

“Chụpụnụ Ndị Niile Bi n’Ala Ahụ”

“Chụpụnụ Ndị Niile Bi n’Ala Ahụ”

Jehova gwara ndị ya ka ha wepụ ihe ọ bụla nwere ike ime ka ha kwụsị ife ya ma ha banye n’Ala Nkwa ahụ (Ọnụ Ọgụ. 33:52; w10 8/1 23)

Jehova ga-agọzi mbọ ha ga-agba iweghara ala ahụ niile (Ọnụ Ọgụ. 33:53)

Nsogbu ga-adị ma ọ bụrụ na ndị Izrel emerighị ndị iro ha niile (Ọnụ Ọgụ. 33:55, 56; w08 2/15 27 ¶4-5; it-1 404 ¶2)

Iji mee ihe dị Jehova mma, anyị ga-esepụrịrị aka n’omume ọ bụla Jehova kpọrọ asị ma ọ bụ n’ihe ọ bụla nwere ike imebi ofufe anyị na-efe ya. (Jems 1:21) Jehova na-enye anyị ike anyị ga-eji lụso omume ọjọọ na mmụọ nke ụwa a ọgụ.