Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA | MEE KA OZI ỌMA NA-ATỌKWU GỊ ỤTỌ

Jiri Ihe Atụ Na-akọwa Ihe Ndị Bụ́ Isi

Jiri Ihe Atụ Na-akọwa Ihe Ndị Bụ́ Isi

Anyị gaara mmadụ nletaghachi ma ọ bụ duziwere ya ọmụmụ Baịbụl, anyị kwesịrị inyere onye ahụ aka ịghọta isi ihe anyị na-ekwu. Ọ bụrụ na anyị ejiri ihe atụ kụziere ya ihe, ọ ga-eme ka ihe anyị na-akụzi ruo ya n’obi, ya adịkwara ya mfe icheta ya.

Ị kwadebewe ịga nletaghachi ma ọ bụ iduzi ọmụmụ Baịbụl, chọpụta isi ihe ndị ị ga-eji ihe atụ kọwaa, ọ bụghị ihe ndị na-adịchaghị mkpa. Jirizie ihe ndị a na-ahụ kwa ụbọchị mee ihe atụ dị mfe. (Mat. 5:14-16; Mak 2:21; Luk 14:7-11) Cheekwa banyere ebe onye ị na-amụrụ ihe si na ihe ndị ọ na-eme. (Luk 5:2-11; Jọn 4:7-15) Ị chọpụta na obi dị ya ụtọ n’ihi na ọ ghọtara ihe ị kụziiri ya, gịnwa ga-enwekwa obi ụtọ.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NA-ENWE ỌṄỤ A NA-ENWE N’IHI IME NDỊ NA-ESO ỤZỌ—NA-EME KA OTÚ I SI EZI OZI ỌMA KA MMA—NA-EJI IHE ATỤ EME KA IHE NDỊ BỤ́ ISI DOO ANYA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Gịnị mere o nwere ike iji dị mkpa ka anyị nyere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka ịghọta amaokwu Baịbụl ndị anyị gụrụ?

  • Olee otú Linda si jiri ihe atụ kọwaa eziokwu dị ná Ndị Rom 5:12?

  • Iji ezigbo ihe atụ akụzi ihe na-eme ka ihe a na-akụzi ruo mmadụ n’obi

    Olee uru iji ezigbo ihe atụ kụzie ihe ga-abara ndị anyị na-agwa okwu?

  • Gịnị mere anyị ji kwesị iji vidio na ihe ndị ọzọ nzukọ Jehova wepụtara maka ịkụzi ihe na-akụzi ihe n’ozi ọma?