Mee 24-30
ỌNỤ ỌGỤGỤ 34-36
Abụ nke 33 na Ekpere
Okwu Mmeghe (1 nkeji)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Gbaba n’Ime Jehova”: (Nkeji 10)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 10)
Ọnụ Ọgụ. 35:31—Gịnị mere na Adam na Iv agaghị erite uru n’àjà mgbapụta Jizọs? (w91 2/15 13 ¶13)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova Chineke, ozi anyị, ma ọ bụ ihe ọzọ?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4) Ọnụ Ọgụ. 34:1-15 (th ihe ọmụmụ nke 10)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 3) Jiri ihe dị n’ebe e dere Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta mee ya. Zie ya ozi ọma n’agbanyeghị na o kwuru ihe ndị na-achọghị ịnụ ozi ọma na-ekwukarị. (th ihe ọmụmụ nke 12)
Nletaghachi: (Nkeji 4) Buru ụzọ mee ihe dị n’ebe e dere Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta. Gosi ya vidio bụ́ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? Mee ka ị̀ kpọnyeere ya vidio ahụ, unu emeekwa ozugbo ka ùnu elechaala ya. (th ihe ọmụmụ nke 9)
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 5) fg isi nke 2 ¶9-10 (th ihe ọmụmụ nke 19)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Bụrụ Enyi Jehova—Onye A Hụrụ n’Anya Ka A Na-adọ Aka ná Ntị: (Nkeji 6) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio ahụ. O kwe mee, jụọ ụmụaka ụfọdụ i bu ụzọ họrọ ajụjụ ndị a: Gịnị mere o ji dị mkpa ka a dọọ gị aka ná ntị mgbe ụfọdụ? Olee otú ịdọ aka ná ntị si abara gị uru? Gịnị mere Jehova ji adọ anyị aka ná ntị?
“Ịdọ Aka ná Ntị Na-egosi na Jehova Hụrụ Anyị n’Anya”: (Nkeji 9) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio bụ́ “Onye Jehova Hụrụ n’Anya Ka Ọ Na-adọ Aka ná Ntị.”
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) bt isi nke 9 ¶19-24 na igbe dị na peeji nke 73
Okwu Mmechi (Nkeji 3)
Abụ nke 93 na Ekpere