Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Nọgide Na-adị Njikere ná Ngwụcha ‘Oge Ikpeazụ A’

Nọgide Na-adị Njikere ná Ngwụcha ‘Oge Ikpeazụ A’

Ka ‘oge ikpeazụ a’ na-abịa na njedebe, anyị na-atụ anya nsogbu ndị kpụ ọkụ n’ọnụ. (2 Tim. 3:1; Mat. 24:8) E nwee ọdachi, a na-enyekarị ndị Jehova ntụziaka ndị ga-azọ ha ndụ ozugbo. Ihe nwere ike ịzọ anyị ndụ mgbe ahụ bụ otú anyị si rube isi ma kwadebe nke ọma ugbu a n’ime ka adịm ná mma anyị na Jehova sikwuo ike nakwa n’iwekọta ihe ndị dị mkpa.—Luk 16:10.

  • Mee ka adịm ná mma gị na Jehova sikwuo ike: Jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe ugbu a. Mụta ụzọ dị iche iche e si ekwusa ozi ọma. Ọ bụrụ na ọdachi emee ka ị gbaga ebe ị na-anaghịzi ahụ ụmụnna ruo oge ụfọdụ, atụla ụjọ. (Aịza. 30:15) Jehova na Jizọs nọ gị nso.—od 176 ¶15-17

  • Wekọta ihe ndị dị mkpa: Anyị kwesịrị inwe akpa anyị kwanyere ihe ndị dị mkpa anyị ga-eji agbapụ. Ma e wezụga nke ahụ, ezinụlọ ọ bụla kwesịkwara inwe ihe oriri, mmiri, ọgwụ, na ihe ndị ọzọ ha dowere edowe, a dịghị ama ama ya abụrụ na ha agaghị apụta èzí ruo oge ụfọdụ.—Ilu 22:3; g17.5 4, 6

LEENỤ VIDIO BỤ́ Ì JIKERELA MAKA ỌDACHI NDỊ NA-EMERE ONWE HA? ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee otú anyị ga-esi eme ka adịm ná mma anyị na Jehova sikwuo ike ugbu a tupu ọdachi emee?

  • Gịnị mere anyị kwesịrị iji . . .

    • hụ na anyị na-akọrọ ndị okenye otú ihe si kwụrụ?

    • kwadebe akpa anyị kwanyere ihe anyị ga-eji gbapụ?

    • tụlee ụdị ọdachi ndị nwere ike ime n’ebe anyị bi na ihe ndị anyị ga-eme ma nke ọ bụla n’ime ha mee?

  • Olee ụzọ atọ anyị nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka ma ọdachi mee?

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee ihe ọrịa korona vaịrọs kụziiri m banyere ịdị njikere?’