AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
Ekwela Ka Ọchịchọ Ọjọọ Na-achị Gị
Devid kwere ka ọchịchị ọjọọ gbanye mgbọrọgwụ n’obi ya (2 Sam. 11:2-4; w21.06 17 ¶10)
Devid ji ikike o nwere zochie ihe ọjọọ o mere. Ihe a o mere adịghị mma (2 Sam. 11:5, 14, 15; w19.09 17 ¶15)
Devid tara ọtụtụ ahụhụ maka mmehie o mere (2 Sam. 12:9-12; w18.06 17 ¶7)
Anyị kwesịrị ịmụta ịna-ejide onwe anyị. Ọ bụ ya ga-eme ka anyị ghara ịna-ele ma ọ bụ na-eche ihe na-adịghị mma. (Gal. 5:16, 22, 23) Jehova ga-enyeliri anyị aka ka anyị ghara ikwe ka ihe ọjọọ gbanye mgbọrọgwụ n’obi anyị.
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: ‘Olee ihe ndị m kwesịrị ịgbakwu mbọ ka m ghara ịna-eche?’