Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Na-achịkwa Ọchịchọ Gị

Na-achịkwa Ọchịchọ Gị

Ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè, anyị ga na-agba mbọ mgbe niile na-achịkwa ọchịchọ anyị. Ọ bụrụ na anyị ahapụ ịchịkwa ya, o nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ na-ekwe ka ọchịchọ inweta ihe oriri, uwe, na ebe obibi mee ka ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ belata. Ndị ọzọ na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ n’agbanyeghị na o megidere iwu Chineke. (Rom 1:​26, 27) E nwekwara ndị nke na-eme ihe ọjọọ ndị ọgbọ ha na-agwa ha mee n’ihi na ha achọghị ka ndị ọgbọ ha na-akpapụ ha iche.​—Ọpụ. 23:2.

Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-achịkwa ọchịchọ anyị? Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka uche anyị na-adị n’ihe gbasara ofufe Chineke. (Mat. 4:4) Anyị kwesịkwara ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka ịna-achịkwa ọchịchọ anyị. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ ma ihe ga-akacha abara anyị uru. Ọ makwa otú ọ ga-esi enye anyị ihe ndị dị mma na-agụ anyị agụụ.​—Ọma 145:16.

LEENỤ VIDIO BỤ́ EKWELA KA SỊGA LAA NDỤ GỊ N’IYI, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee ihe mere ụfọdụ ndị ji aṅụ sịga?

  • Olee nsogbu ịṅụ sịga nwere ike ịkpatara gị?

  • Gịnị mere ịṅụ sịga ji dị njọ, ma nke nkịtị ma nke elektrọnik?​—2 Kọr. 7:1

  • Ị ga-emerili agụụ ịṅụ sịga

    Gịnị ga-enyere gị aka ịjụ ịṅụ sịga ma ọ bụ ịkwụsị ịṅụ ya?