Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Jiri Akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi Na-eme Ka Okwukwe Ndị Mmadụ Sie Ike n’Ebe Jehova na Jizọs Nọ

Jiri Akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi Na-eme Ka Okwukwe Ndị Mmadụ Sie Ike n’Ebe Jehova na Jizọs Nọ

Ihe ga-enyere ndị na-amụ Baịbụl aka ime ihe Chineke na-achọ bụ inwe okwukwe siri ike. (Hib. 11:6) Anyị nwere ike iji akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi nyere ha aka ime ya. Akwụkwọ a nwere amaokwu Baịbụl, ajụjụ, ọmarịcha vidio, na ọmarịcha foto ndị ga-abara ha ezigbo uru. A kọwakwara ihe niile dị na ya n’ụzọ doro anya. Ọ bụrụ na anyị akụziere ha ịna-akpa àgwà e ji mara Ndị Kraịst, nyekwara ha aka ịbụ enyi Jehova, ọ pụtara na anyị ji ihe ọkụ na-agaghị emebi na-arụ ụlọ.​—1 Kọr. 3:​12-15.

Ụfọdụ na-eche na ha agaghị abụli enyi Chineke n’ihi na ha anaghị ahụ Chineke anya. N’ihi ya, anyị kwesịri inyere ha aka ịmata ụdị onye Jehova bụ na inwe okwukwe n’ebe ọ nọ.

LEENỤ VIDIO BỤ́ JIRI AKWỤKWỌ “NA-ENWE OBI ỤTỌ RUO MGBE EBIGHỊ EBI” NA-EME KA OKWUKWE NDỊ MMADỤ SIE IKE N’EBE JEHOVA NỌ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee otú anyị si mara na nwanna nwaanyị ahụ kwadoro nke ọma maka ọmụmụ ihe ahụ?

  • Olee otú o si jiri ajụjụ ntụkwasị ndị dabara adaba mee ka onye ọ na-amụrụ ihe kwuo ihe o chere banyere ihe dị n’Aịzaya 41:​10, 13?

  • Olee uru vidio na amaokwu Baịbụl ndị ahụ baara onye ahụ a na-amụrụ ihe?

Ọtụtụ ndị aghọtaghị otú o si bụrụ na Jizọs ji ndụ ya gbapụta anyị. O nwekwara ike ịbụ na ha anaghị ele àjà ahụ Jizọs chụrụ anya ka onyinye Chineke nyere hanwa. (Gal. 2:20) N’ihi ya, anyị kwesịrị inyere ha aka ka ha nwee okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs.

LEENỤ VIDIO BỤ́ JIRI AKWỤKWỌ “NA-ENWE OBI ỤTỌ RUO MGBE EBIGHỊ EBI” NA-EME KA OKWUKWE NDỊ MMADỤ SIE IKE N’EBE JIZỌS NỌ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee otú anyị si mara na nwanna nwoke ahụ kwadoro nke ọma maka ọmụmụ ihe ahụ?

  • Olee otú o si jiri ihe dị n’ebe e dere “Ihe Ị Ga-elebakwu Anya” nyere onye ọ na-amụrụ ihe aka?

  • Gịnị mere ikpe ekpere maka onye ahụ a na-amụrụ ihe ji dị ezigbo mkpa?