Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

‘Ịhụnanya . . . Anaghị Ebuli Onwe Ya Elu’

‘Ịhụnanya . . . Anaghị Ebuli Onwe Ya Elu’

Ịhụnanya na-enyere anyị aka ịdị umeala n’obi. (1 Kọr. 13:4) Anyị hụ ụmụnna anyị n’anya, anyị agaghị na-eche na anyị ka ha mma. Anyị ga na-ahụ ebe ndị ha na-eme nke ọma, jirikwa nkà ndị anyị nwere na-enyere ha aka. (Fil. 2:​3, 4) Ọ bụrụ na anyị ana-egosikwu ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya, Jehova ga-ejikwu anyị na-emezu uche ya.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NA-ECHETA OTÚ ONYE NWERE ỊHỤNANYA SI AKPA ÀGWÀ​—Ọ DỊGHỊ AFỤLI ONWE YA ELU, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee onyinye ndị Absalọm nwere?

  • Olee otú o si jiri onyinye ndị ahụ mee ihe na-adịghị mma?

  • Olee otú anyị ga-esi zere ịna-ebuli onwe anyị elu?​—Gal. 5:26