AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
Absalọm Dị Mpako. Ọ Bụ Ya Mere O Ji Chọọ Ịnara Nna Ya Ọchịchị
Absalọm chọrọ ka a na-eto ya (2 Sam. 15:1; it-1 860)
Absalọm nwetara obi ndị Izrel (2 Sam. 15:2-6; w12 7/15 13 ¶5)
Absalọm gbalịrị ịnara nna ya ọchịchị (2 Sam. 15:10-12; it-1 1083-1084)
Anyị ekwesịghị ikwe ka anyaukwu gbanye mgbọrọgwụ n’obi anyị. Kama, anyị kwesịrị ịna-enyocha ihe anyị bu n’obi na-eme ihe anyị na-eme. Kama ịchọ ime ihe ga-adị naanị onwe anyị mma, anyị kwesịrị ịna-achọ ime ihe ga-adị ndị ọzọ mma.—Fil. 2:3, 4.