Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

‘Ịhụnanya . . . Anaghị Aṅụrị Ọṅụ n’Ihe Ọjọọ’

‘Ịhụnanya . . . Anaghị Aṅụrị Ọṅụ n’Ihe Ọjọọ’

Ezigbo Ndị Kraịst na-agba mbọ ka ịhụnanya na-edu ha n’ihe niile ha na-eme. Ịhụnanya ‘anaghị aṅụrị ọṅụ n’ihe ọjọọ.’ (1 Kọr. 13:​4, 6) Ọ bụ ya mere anyị anaghị eji ihe ndị na-egosi omume rụrụ arụ na tigbuo zọgbuo atụrụ ndụ. Anyị anaghịkwa aṅụrị ọṅụ ma ihe ọjọọ mee ndị ọzọ, ọ sọgodị ya bụrụ ndị mejọrọ anyị.​—Ilu 17:5.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NA-ECHETA OTÚ ONYE NWERE ỊHỤNANYA SI AKPA ÀGWÀ​—Ọ DỊGHỊ AṄỤRỊ ỌṄỤ N’IHI AJỌ OMUME, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Gịnị ka Devid mere mgbe ọ matara na Sọl na Jonatan anwụọla?

  • Olee abụ iru uju Devid dere maka Sọl na Jonatan?

  • Gịnị mere Devid aṅụrịghị ọṅụ na Sọl anwụọla?