Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

“Ịhụnanya . . . Na-enwe Olileanya Ihe Niile”

“Ịhụnanya . . . Na-enwe Olileanya Ihe Niile”

Ezigbo ịhụnanya anyị nwere n’ebe ụmụnna anyị nọ na-eme ka anyị na-enwe olileanya na ha ga-eme ihe dị mma. (1 Kọr. 13:​4, 7) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwanna emee mmehie, a dọọkwa ya aka ná ntị, anyị na-enwe olileanya na ọ ga-ekwe ka a gbazie ya. Anyị na-enwere ndị okwukwe ha na-esighị ike ndidi, ma na-agbalị enyere ha aka. (Rom 15:1) Ọ bụrụ na mmadụ apụọ n’ọgbakọ, anyị anaghị akwụsị inwe olileanya na ọ ga-alọghachi otu ụbọchị.​—Luk 15:​17, 18.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NA-ECHETA OTÚ ONYE NWERE ỊHỤNANYA SI AKPA ÀGWÀ​—Ọ NA-ENWE OLILEANYA IHE NIILE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Ònye ka Abna na-akwadobu? Gịnịzi mere o ji gbanwee?

  • Olee ihe Devid mere mgbe Abna bịara rịọ ya ka ha dịrị ná mma? Gịnịkwanụ ka Joab mere?

  • Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-enwe olileanya na ụmụnna anyị mere ihe na-adịghị mma ga-agbanwe?