Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Devid na-echebara ọgbụgba ndụ ya na Jehova gbara echiche

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Jehova na Devid Gbara Ndụ

Jehova na Devid Gbara Ndụ

Jehova kwere Devid nkwa na ọ ga-eme ka o nwee Alaeze (2 Sam. 7:​11, 12, na ihe e dere n’ala ala peeji banyere amaokwu nke 11; w10 4/1 20 ¶3; lee ihe e sere n’ihu akwụkwọ a)

Ụfọdụ n’ime ihe Jehova kwuru n’ọgbụgba ndụ ya na Devid gbara mezuru n’isi Mezaya ahụ (2 Sam. 7:​13, 14; Hib. 1:5; w10 4/1 20 ¶4)

Ihe ọma ndị Mezaya ga-eme ga-abara anyị uru ruo mgbe ebighị ebi (2 Sam. 7:​15, 16; Hib. 1:8; w14 10/15 10 ¶14)

Anyanwụ na ọnwa na-echetara anyị na ọchịchị Mezaya ga-adịru mgbe ebighị ebi. (Ọma 89:​35-37) Mgbe ọ bụla ị hụrụ ha, chee banyere ihe ọma ndị Jehova kwere nkwa na ọ ga-eji gọzie gị na ezinụlọ gị n’Alaeze ya.