Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ekwela Ka Ndị Si n’Ezi Ofufe Dapụ Nweta Gị

Ekwela Ka Ndị Si n’Ezi Ofufe Dapụ Nweta Gị

Ọtụtụ mgbe, Setan na ndị o ji kwara ngwá ọrụ na-agwakọta ụgha na eziokwu iji mee ka okwukwe anyị ghara isi ike. (2 Kọr. 11:3) Dị ka ihe atụ, ndị Asiria ji okpookpo ụgha na ụgha ndị a gwakọtara ha na eziokwu gbalịa ime ka ndị Jehova daa mbà n’obi. (2 Ihe 32:10-15) Ndị si n’ezi ofufe dapụ na-emekwa otú ahụ taa. Ma, olee otú anyị kwesịrị isi were ihe ndị si n’ezi ofufe dapụ na-akụzi? Were ha ka nsí na-egbu egbu. Agụkwala ha, a zaghachikwala ha, ma ọ bụ kwughachi ihe ha kwuru. Gbalịa na-achọpụta ihe ọ bụla e kwuru iji mee ka mmadụ nyowe Jehova na nzukọ ya enyo ma jụ ya ozugbo.​—Jud 3, 4.

LEENỤ VIDIO SI NA VIDIO BỤ́ “LỤSIE ỌGỤ IKE MAKA OKWUKWE,” ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Gịnị mere anyị kwesịrị iji kpachara anya ma ọ bụrụ na anyị na-aga n’ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet?

  • Olee otú anyị nwere ike isi mee ihe e kwuru ná Ndị Rom 16:17?