Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ị̀ Na-ege Baịbụl A Na-egere Egere?

Ị̀ Na-ege Baịbụl A Na-egere Egere?

Gịnị bụ Baịbụl a na-egere egere? Baịbụl a na-egere egere bụ Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ a gụrụ agụ ma mepụta ya ka a na-egere ya egere. Anyị ji nwayọọ nwayọọ na-ewepụtakwu ya n’ọtụtụ asụsụ. Otu ihe magburu onwe ya na Baịbụl a a na-egere egere bụ na e ji olu dị iche iche gụọ okwu onye nke ọ bụla a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl. E jikwa ụda olu kwesịrị ekwesị gụọ okwu ndị ahụ ka a ghara ịghọtahie ihe Baịbụl na-ekwu.

Olee uru Baịbụl a a na-egere egere na-abara ndị na-ege ya? Ọ na-atọ ọtụtụ ndị na-ege ya mgbe niile ezigbo ụtọ n’ihi na ọ na-eme ka akụkọ ndị dị n’Okwu Chineke dịkwuo ha ka ihe mere eme. Ha kwuru na otú ahụ e si jiri olu dị iche iche gụọ ihe onye nke ọ bụla a kọrọ akụkọ ya kwuru na-eme ka ọ dị ha ka hà nọ mgbe ihe ahụ a na-akọ na-eme, na-emekwa ka ha ghọtakwuo ihe e dere na Baịbụl nke ọma. (Ilu 4:5) Ọtụtụ ndị ekwuokwala na ige ya na-eme ka obi jụrụ ha ma ha chegbuwe onwe ha.​—Ọma 94:19.

Ịnụ ka a na-agụpụta Okwu Chineke nwere ike ịkpa ezigbo ike ná ndụ anyị. (2 Ihe 34:19-21) Ọ bụrụ na unu nwere Baịbụl a a na-egere egere nke zuru ezu ma ọ bụkwanụ nke na-ezughị ezu n’asụsụ unu, gbalịa mee ka ige ya soro n’ihe ndị ị na-eme mgbe niile ná ndụ gị.

LEENỤ VIDIO SI NA VIDIO BỤ́ OTÚ E SI AKWADEBE BAỊBỤL A NA-EGERE EGERE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ A:

Gịnị masịrị gị banyere otú e si emepụta Baịbụl a na-egere egere?