Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ka Ịmalite Mkparịta Ụka Na-atọ Gị Ụtọ

Ka Ịmalite Mkparịta Ụka Na-atọ Gị Ụtọ

Anyị na ndị mmadụ ịkparịta ụka mgbe anyị na-anọghị n’ozi so n’ụzọ kacha eme obi ụtọ na ụzọ magburu onwe ya e si ekwusa ozi ọma. Ma, ụjọ nwere ike ijide anyị ịmalite mkparịta ụka ma ọ bụrụ na anyị na-echegbukarị onwe anyị banyere otú anyị ga-esi ewebata ihe Baịbụl kwuru. Kama ịna-echegbu onwe gị gbasara ihe ị ga-ekwu iji zie onye gị na ya na-akparịta ụka ozi ọma, lekwasị anya n’igosi ya na i nwere mmasị n’ebe ọ nọ. (Mat. 22:39; Fil. 2:4) Ọ bụrụ na mgbe unu na-akparịta ụka, ohere adapụta ka i zie ya ozi ọma, i nwere ọtụtụ ihe ga-enyere gị aka ime otú ahụ.

Olee otú ihe ndị a anyị ji ezi ozi ọma ga-esi enyere gị aka iji ihe gị na mmadụ kwuru mgbe unu na-akparịta ụka zie ya ozi ọma?

LEENỤ VIDIO BỤ́ “A NA-EJI ÍGWÈ AMỤCHA ÍGWÈ”​—ỊMALITE MKPARỊTA ỤKA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ A:

Olee ihe atọ ga-enyere anyị aka ịna-emekwu nke ọma n’ịmalite mkparịta ụka?