Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Jehova Bụ “Nna Ụmụ Na-enweghị Nna”

Jehova Bụ “Nna Ụmụ Na-enweghị Nna”

Kwa afọ, ọtụtụ ndị na-eto eto na-ekpebi na ha ga-abụ enyi Jehova. (Ọma 110:3) Unu ndị na-eto eto, ihe banyere onye ọ bụla n’ime unu na-emetụ Jehova n’obi. Ọ ghọtara ihe ndị unu na ha na-alụ, ọ na-ekwekwa unu nkwa na ọ ga-enyere unu aka ife ya. Ọ bụrụ na ọ bụ naanị mama gị ma ọ bụ naanị papa gị na-azụ gị, cheta na Jehova bụ “nna ụmụ na-enweghị nna.” (Ọma 68:5) Ọ bụrụ na Jehova azụọ gị, ihe ga-agaziri gị n’agbanyeghị otú ihe si dịrị gị n’ụlọ unu.​—1 Pita 5:10.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NDỊ NA-AGBASI MBỌ IKE KA OKWUKWE HA SIE IKE​—NDỊ NAANỊ NNE MA Ọ BỤ NNA HA NA-AZỤ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Gịnị ka ị mụtara n’ihe Tammy, Charles, na Jimmy kọrọ?

  • Olee ihe e kwuru n’Abụ Ọma 27:10 ga-emesi ndị ọ bụ naanị papa ha ma ọ bụ naanị mama ha na-azụ obi ike?