Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ì Jikerela Maka Ihe Isi Ike?

Ì Jikerela Maka Ihe Isi Ike?

Ọ naghị eju anyị anya ma ihe ndị na-eme n’ụwa mee ka ihe siwere ndị mmadụ ike n’ebe niile. Gịnị mere ọ naghị eju anyị anya? Ọ bụ n’ihi na anyị bi ná ngwụcha ngwụcha oge ikpeazụ. Baịbụl gwakwara anyị ka anyị ghara ịtụkwasị “akụnụba a na-ejighị n’aka” obi. (1 Tim. 6:17; 2 Tim. 3:1) Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Eze Jehoshafat banyere ijikere maka ihe isi ike?

Mgbe ndị iro ndị Izrel na-achọ ịlụso ha agha, Jehoshafat tụkwasịrị Jehova obi. (2 Ihe 20:9-12) O mekwara ihe ụfọdụ iji kwadebe obodo ya maka agha, dị ka ịrụ obodo ndị siri ike na idowe ndị agha n’ebe dị iche iche. (2 Ihe 17:1, 2, 12, 13) Anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi ka Jehoshafat, meekwa ihe ndị anyị kwesịrị ime iji jikere maka ihe isi ike.

LEENỤ VIDIO BỤ́ Ì JIKERELA MAKA ỌDACHI?, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Gịnị ka onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ime iji jikere maka ọdachi?

  • Olee otú anyị nwere ike isi jikere maka inyere ndị ọzọ aka?