Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

“Tụkwasịnụ Jehova Bụ́ Chineke Unu Obi”

“Tụkwasịnụ Jehova Bụ́ Chineke Unu Obi”

Mgbe ndị iro bịara ịlụso Jehoshafat na ndị Juda agha, ha rịọrọ Jehova ka o nyere ha aka (2 Ihe 20:12, 13; w14 12/15 23 ¶8)

Jehova kasiri ndị ya obi ma gwa ha ihe doro anya ha ga-eme (2 Ihe 20:17)

Jehova zọpụtara ndị ya n’ihi na ha tụkwasịrị ya obi (2 Ihe 20:21, 22, 27; w21.11 16 ¶7)

Mgbe Gọg ga-alụso ndị Jehova agha n’oge oké mkpagbu, ndị tụkwasịrị Jehova na ndị o ji eduzi nzukọ ya obi agaghị atụ ụjọ ihe ọ bụla.​—2 Ihe 20:20.