Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Eji Akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị Na-amụrụ Ndị Mmadụ Ihe

Otú Anyị Ga-esi Eji Akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị Na-amụrụ Ndị Mmadụ Ihe

Akwụkwọ Baịbụl Na-akụziri Anyị na akwụkwọ Baịbụl Na-akụzi yiri ibe ha. Otú e sikwa kọwaa eziokwu Baịbụl ndị dị n’ime ha yiri. Ma, okwu ndị e ji dee akwụkwọ Baịbụl Na-akụziri Anyị dị mfe nghọta, dookwa anya. Ọ ga-adịrị ndị na-anaghị aghọtacha akwụkwọ Baịbụl Na-akụzi mfe iji ya mụọ ihe. Akwụkwọ Baịbụl Na-akụziri Anyị enweghị Isiokwu Ndị Ọzọ. Kama, o nwere ebe a na-akpọ Ihe Ndị E Dere ná Ngwụcha Akwụkwọ A. Isiokwu ndị dị na ya enweghị ajụjụ mmalite, ha enweghịkwa igbe ntụleghachi. Kama, isiokwu ọ bụla nwere ebe a chịkọtara eziokwu ndị dị na ya. Anyị nwere ike inye mmadụ akwụkwọ Baịbụl Na-akụziri Anyị ọ bụrụgodị na ọ bụghị ya ka a na-enye n’ọnwa ahụ. Olee otú anyị nwere ike isi jiri ihe ọhụrụ ndị dị na ya mụọrọ mmadụ ihe?

NCHỊKỌTA: Anyị nwere ike iji akwụkwọ a na-amụrụ ndị mmadụ ihe otú ahụ anyị si ejibu akwụkwọ Baịbụl Na-akụzi amụrụ ndị mmadụ ihe, ya bụ, a gụchaa paragraf, a jụọ ajụjụ ya. Ọ bụrụ na onye anyị na-amụrụ ihe amachaghị asụsụ anyị ji na-amụrụ ya ihe ma ọ bụkwanụ na ọ machaghị ihe agụ, akwụkwọ ọhụrụ a ga-abara ya uru. Anyị na ya nwere ike ịtụle ihe dị ná nchịkọta isiokwu anyị chọrọ ịmụ, anyị agwazie ya ka ọ gụọ paragraf ndị dị n’isiokwu ahụ n’oge nke aka ya. Anyị nwere ike iji ihe dị ka nkeji iri na ise kụziere ya otu eziokwu Baịbụl dị ná nchịkọta ahụ. Ebe ọ bụ na ọ bụghị ihe niile dị n’isiokwu ahụ ka e dere ná nchịkọta, anyị kwesịrị ịkwadebe nke ọma ka anyị mara ihe ndị anyị ga-akọwara onye ahụ. Ma, ọ bụrụ na anyị amụọrọ mmadụ paragraf ndị dị n’isiokwu ahụ, anyị nweziri ike iji ihe ndị e dere ná nchịkọta tụleghachi ihe ndị anyị mụrụ.

IHE E DERE NÁ NGWỤCHA AKWỤKWỌ A: A haziri ihe ndị e dere ná ngwụcha akwụkwọ Baịbụl Na-akụziri Anyị n’usoro ha si gbaa n’ime ya. Ọ bụ onye na-amụrụ mmadụ ihe ka ọ dịịrị ikpebi ma ọ̀ ga-akọwara onye ọ na-amụrụ ihe ihe ndị ahụ mgbe ha na-amụ ihe ma ọ̀ bụ na ọ gaghị eme otú ahụ.