Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | EKLIZIASTIS 7-12

“Cheta Onye Okike Ukwu Gị n’Oge Ị Bụ Okorobịa”

“Cheta Onye Okike Ukwu Gị n’Oge Ị Bụ Okorobịa”

Jiri ike na amamihe i nwere n’oge okorobịa jeere Onye Okike Ukwu gị ozi

12:1, 13

  • Ọtụtụ ndị na-eto eto nwere ikike ha ga-eji rụọ ọrụ ndị siri ike n’ọgbakọ Jehova

  • Ndị na-eto eto kwesịrị iji oge ha na ike ha jeere Jehova ozi tupu nká abịa

Sọlọmọn ji ihe atụ dị iche iche kọwaa nsogbu ya na nká so aga

12:2-7

  • Amaokwu nke 3: “Mgbe anya gbaworo ndị inyom na-elepụ anya na windo ọchịchịrị”

    Ha anaghịzi ahụcha ụzọ

  • Amaokwu nke 4: “Mgbe olu ụmụ nwaanyị niile na-abụ abụ na-adịkwaghị adapụta adapụta”

    Ha anaghịzi anụcha ihe

  • Amaokwu nke 5: “Mkpụrụ osisi kepa agbawaakwa”

    Nri anaghịzi atọcha ha ụtọ