Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ndị Na-eto Eto, Unu Egbula Oge Isi ‘n’Ọnụ Ụzọ Buru Ibu’ Banye

Ndị Na-eto Eto, Unu Egbula Oge Isi ‘n’Ọnụ Ụzọ Buru Ibu’ Banye

Ọ naghị esiri ndị na-eto eto ike ichewe na ha ga-anọgide na-abụ okoro na agbọghọ. Ha na-eche na o nweghị mgbe “oge ọdachi” ya na nká so ga-erute ha aka n’ụwa Ekwensu a. (Ekli. 12:1) Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, ị̀ na-eche na oge ka dị, n’ihi ya, na o rubeghị mgbe ị ga-ewepụta onwe gị jekwuoro Jehova ozi, dị ka ije ozi oge niile?

“Oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị” anyị niile, ma ndị na-eto eto. (Ekli. 9:11) “Unu amaghị ihe ndụ unu ga-abụ echi.” (Jems 4:14) N’ihi ya, asịkwala e mechaa gị ewepụta onwe gị ijekwuru Chineke ozi. Si ‘n’ụzọ buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ’ banye ugbu a ị ka nwere ike ime ya. (1 Kọr. 16:9) Ị gaghị akwa m makwaara ma i mee ya.

Ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi jekwuo ozi:

  • Iji asụsụ ọzọ na-ezi ozi ọma

  • Ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ

  • Ịga ụlọ akwụkwọ dị iche iche nzukọ a nwere

  • Ịrụrụ nzukọ Jehova ụlọ

  • Ije ozi na Betel

  • Ịbụ onye nlekọta sekit

Ụzọ ndị m chọrọ isi jekwuo ozi.