OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Onye Nwe Ya Bụ Onye A Ma Ama n’Ọnụ Ụzọ Ámá”
Ezigbo nwaanyị na-eme ka di ya nwee aha ọma. N’oge Eze Lemuel, nwoke lụtara ezigbo nwaanyị na-abụ “onye a ma ama n’ọnụ ụzọ ámá.” (Ilu 31:23) N’oge anyị a, ọ bụ ụmụnna nwoke ndị a na-akwanyere ùgwù n’ọgbakọ na-abụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. Ọ bụrụ na ha lụrụ nwaanyị, ihe ga-eme ka ha na-eje ozi ha bụ ma nwunye ha na-akpa àgwà ọma ma na-akwado ha. (1 Tim. 3:
Otú ezigbo nwaanyị ga-esi na-akwado di ya n’ọrụ ọ na-arụ n’ọgbakọ bụ . . .
-
ịna-agba ya ume.
—Ilu 31:26 -
ịna-enye ya ohere ịrụ ọrụ ọgbakọ.
—1 Tesa. 2: 7, 8 -
ịna-ebi ndụ dị mfe.
—1 Tim. 6:8 -
ịghara ịna-aghụ di ya ọnụ ka ọ mata ihe ụfọdụ na-eme n’ọgbakọ ọ na-ekwesịghị ịma.
—1 Tim. 2: 11, 12; 1 Pita 4:15