Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 JỌN 1-13; 3 JỌN 1-14JUD 1-25

Anyị Ga-agbasi Mbọ Ike Ka Anyị Nọgide n’Eziokwu

Anyị Ga-agbasi Mbọ Ike Ka Anyị Nọgide n’Eziokwu

Jud 3

Jizọs gwara anyị, sị: “Gbalịsienụ ike ka unu si n’ọnụ ụzọ dị warara banye.” (Luk 13:24) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na anyị ga-agbasi mbọ ike ka ihe anyị na-eme na-adị Chineke mma. Jud, bụ́ nwanne Jizọs, si n’ike mmụọ nsọ dee ihe yiri ihe a Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Lụsie ọgụ ike maka okwukwe ahụ.” Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike iji mee ihe ndị a na-esonụ:

  • Zere omume rụrụ arụ.—Jud 6, 7

  • Na-akwanyere ndị nọ n’isi ùgwù.—Jud 8, 9

  • Na-eme ka obi na-esikwu anyị ike ‘n’okwukwe anyị nke kasị nsọ,’ ya bụ, ozizi Ndị Kraịst.—Jud 20, 21