Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MKPUGHE 1-3

“Amaara M Ihe Ndị Ị Na-eme”

“Amaara M Ihe Ndị Ị Na-eme”

1:20; 2:1, 2

  • “Kpakpando asaa ahụ”: Ndị bụ́ isi ọ nọchiri anya ha bụ ndị okenye e tere mmanụ, ọ nọchikwara anya ndị okenye niile

  • “N’aka nri [Jizọs]”: Ọ bụ Jizọs na-eduzi kpakpando ndị ahụ, ha nọkwa n’okpuru ya. Ọ bụrụ na e nwere okenye e kwesịrị ịgbazi, Jizọs ga-ahụ na a gbaziri onye ahụ n’oge dị ya mma nakwa otú dị ya mma

  • “Ihe ndọba oriọna asaa ahụ e ji ọlaedo rụọ”: Ọ nọchiri anya ọgbakọ Ndị Kraịst. Ihe ndọba oriọna dị n’ụlọikwuu ahụ na-enwupụta ìhè nkịtị. Ma, ọgbakọ Ndị Kraịst na-enwupụta ìhè nke eziokwu dị n’Okwu Chineke. (Mat. 5:14) Jizọs ije “ije n’etiti” ihe ndọba oriọna ndị ahụ pụtara na ọ bụ yanwa na-eduzi ihe a na-eme n’ọgbakọ Ndị Kraịst niile