Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Jehova Ma Ihe Dị Anyị Mkpa

Jehova Ma Ihe Dị Anyị Mkpa

Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche na-enye anyị nri “n’oge kwesịrị ekwesị.” Ihe a na-egosi na Jehova, bụ́ onye na-eduzi ohu ahụ, ma ihe dị anyị mkpa ga-eme ka okwukwe anyị sie ike. (Mat. 24:45) Mgbakọ ukwu ndị anyị na-enwe, ọmụmụ ihe etiti izu anyị na ọtụtụ ihe ndị ọzọ gosiri na nke a bụ eziokwu.

LEENỤ VIDIO BỤ́ AKỤKỌ KỌMITII IZI IHE NKE ÒTÙ NA-ACHỊ ISI NKE AFỌ 2017, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ NA-ESONỤ:

  • Ònye ka anyị kwesịrị inye otuto maka mgbakọ ndị anyị na-enwe, n’ihi gịnịkwa?

  • Olee mgbe a na-amalite ịkwadebe ihe ndị a ga-eme ná mgbakọ?

  • Olee otú e si ahọta isiokwu mgbakọ?

  • Olee ọrụ ndị a na-arụ iji kwadebe mgbakọ?

  • Olee otú otú anyị si amụ ihe n’ọmụmụ ihe etiti izu si yie otú e si amụ ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied?

  • Olee otú ngalaba dị iche iche si arụkọ ọrụ ọnụ iji kwadebe usoro ihe omume ọmụmụ ihe etiti izu anyị?

Olee otú obi dị gị maka ihe ndị Jehova na-enye anyị iji mee ka okwukwe anyị sie ike?