Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Jehova Hụrụ Onye Na-eji Obi Ụtọ Enye Ihe n’Anya

Jehova Hụrụ Onye Na-eji Obi Ụtọ Enye Ihe n’Anya

2 Ndị Kọrịnt 9:7, a gwara anyị, sị: “Ka onye ọ bụla nye dị ka o kpebiri n’obi ya, ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.” Taa, e nwere ọtụtụ ụzọ ndị dị mfe anyị nwere ike isi jiri Ịntanet nye onyinye iji kwadoo ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ, ma n’obodo anyị ma n’ụwa niile.

LEENỤ VIDIO BỤ́ OTÚ E SI ESI NA KỌMPUTA MA Ọ BỤ N’EKWENTỊ ENYE ONYINYE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ NA-ESONỤ:

  • Olee otú anyị nwere ike isi chọta ebe e dere ụzọ ndị anyị nwere ike isi nye onyinye n’obodo anyị?

  • Olee otú isi n’Ịntanet enye onyinye sirila baara ụfọdụ ndị uru?

  • Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi nye onyinye?

  • Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị amaghị ụzọ anyị nwere ike isi jiri ekwentị ma ọ bụ kọmputa nye onyinye?