Ndị Na-agba Ịnyịnya Anọ Ahụ
Jizọs gara “na-emeri.” O busoro Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya agha ma chụda ha n’ụwa. Jizọs nọgidekwara na-enwe mmeri n’inyere ndị ohu ya aka ma na-echebe ha n’oge ikpeazụ a. Mgbe ọ ‘ga-enwezu mmeri ya’ bụ n’Amagedọn, mgbe ọ ga-eme ka ndị ịnyịnya atọ ndị ọzọ kwụsị ịgba, meekwa ka ụmụ mmadụ nwere onwe ha n’ahụhụ ndị ịnyịnya ahụ kpataara ha.