Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Emela Ka Ndị Ụwa ma Ị Kwadowe Agbamakwụkwọ Gị

Emela Ka Ndị Ụwa ma Ị Kwadowe Agbamakwụkwọ Gị

Ndị Kraịst na-akwado agbamakwụkwọ nwere ọtụtụ ihe ha ga-ekpebi. Ha nwere ike ịchọ ime ka agbamakwụkwọ ha kpọtụ akpọtụ dị ka nke ndị ọzọ nọ n’obodo ha. Ndị ikwu na ndị enyi ha nwere ike ịgwa ha ihe ndị ha chere ha kwesịrị ime n’agbamakwụkwọ ha. Olee ụkpụrụ Baịbụl ndị nwere ike inyere ndị chọrọ ịlụ di na nwunye aka ma ha haziwe ihe ha ga-eme n’ụbọchị ahụ pụrụ iche ná ndụ ha ka ọ ghara ime ka akọnuche ha na-ama ha ikpe, ha agharakwa ịkwa mmakwaara?

LEENỤ VIDIO BỤ́ AGBAMAKWỤKWỌ NKE NA-EME KA E TOO JEHOVA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ NA-ESONỤ:

  • Olee otú ihe Baịbụl kwuru n’amaokwu ndị a na-esonụ si nyere Nick na Juliana aka?

  • Gịnị mere ndị chọrọ ịgba akwụkwọ ji kwesị ịhọrọ nwanna nwoke ma nke a na-akọ n’ọgbakọ ka ọ bụrụ “onye nhazi oriri” ha?—Jọn 2:9, 10.

  • Gịnị mere Nick na Juliana ji kpebie ime ihe ndị ha họọrọ ime n’agbamakwụkwọ ha?

  • Ònye kwesịrị ime mkpebi ikpeazụ maka ihe ndị a ga-eme n’agbamakwụkwọ nakwa n’oriri agbamakwụkwọ?—w06 10/15 25 ¶10.