Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | LEVITIKỌS 4-5

Nye Jehova Ihe Kacha Mma I Nwere

Nye Jehova Ihe Kacha Mma I Nwere

5:5-7, 11

O nweghị onye Izrel ịda ogbenye nwere ike igbochi ime ka ya na Jehova dịrị ná mma. Onye kachadị daa ogbenye n’ime ha nwere ike inye Jehova onyinye, ya anabata ya, ọ bụrụhaala na onye ahụ nyere ihe kacha mma o nwere. O nwere ike inye ntụ ọka. Ma, Jehova chọrọ ka ọ bụrụ nke “e gwere nke ọma,” ụdị nke a na-eji emere onye ọbịa a na-akwanyere ùgwù achịcha. (Jen. 18:6) Taa, Jehova na-anabata “àjà otuto” kacha mma anyị nwere ike inye ya n’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị.—Hib. 13:15.

Ọ bụrụ na ọrịa emee ka ị ghara ịna-emelizi ihe ndị ị na-emebu n’ofufe Jehova, olee otú ihe a nwere ike isi gbaa gị ume?