Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nọvemba 2-8

ỌPỤPỤ 39-40

Nọvemba 2-8

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

  • Vidio Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 4) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio ahụ. Mgbe ọ bụla ajụjụ pụtara na vidio ahụ, kwụsịtụ ya ma jụọ ụmụnna ajụjụ ndị ahụ. Ha zachaa, a kpọnyekwa ya. Kwurịtanụ otú mmadụ nwere ike isi ghara itinye ọnụ n’ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ esemokwu e nwere n’obodo ma onye nwe ụlọ chọọ ka o tinye ọnụ.

  • Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Buru ụzọ mee ihe dị na peeji nke mbụ. Gosi otú i nwere ike isi zaghachi onye nwe ụlọ ma ọ jụọ ihe i chere gbasara otu onye na-azọ ọchịchị ma ọ bụ gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (th ihe ọmụmụ nke 12)

  • Okwu: (Nkeji 5 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) w16.04 23 ¶8-10—Isiokwu: Olee Otú Anyị Nwere Ike Isi Ghara Itinye Aka na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị ná Mkparịta Ụka Anyị nakwa n’Echiche Anyị? (th ihe ọmụmụ nke 14

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

  • Abụ nke 123

  • Na-anụ Ihe Otú Ga-eme Ka Ị Na-aghọta Ihe (Mat. 13:16): (Nkeji 15) Kpọnye vidio ahụ. Jụzie ajụjụ ndị a: Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ege ntị nke ọma? Gịnị ka ihe e dere na Mak 4:23, 24 pụtara? Gịnị ka e nwere ike iji maa atụ ihe e dere ná Ndị Hibru 2:1? Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị na-ege ntị nke ọma?

  • Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) jy isi nke 139

  • Okwu Mmechi (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)

  • Abụ nke 139 na Ekpere