Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma​—Iji Ekwentị Ezi Ozi Ọma

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma​—Iji Ekwentị Ezi Ozi Ọma

IHE MERE O JI DỊ MKPA: Iji ekwentị ezi ozi ọma bụ otu ụzọ mara mma mmadụ nwere ike isi ‘gbasie àmà ike banyere ozi ọma.’ (Ọrụ 20:24) * Ọ na-enyere anyị aka izi mmadụ ozi ọma mgbe anyị na-agaghị enweli ike ịhụ ya ihu na ihu.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Kwadebe akwadebe. Họrọ isiokwu dabara adaba. Depụtazie isi ihe ndị ị chọrọ ikwu. Ọ kacha mma ịnọ ọdụ n’oche, jiri isi ihe ndị ahụ i depụtara na ihe ndị ọzọ dị ka ekwentị ma ọ bụ kọmputa i nwere ike iji mepee JW Library® ma ọ bụkwanụ jw.org®

  • Obi ruo gị ala. Na-ekwu okwu otú i si ekwu. Na-amụmụ ọnụ ọchị ma na-emegharị ahụ́ otú ị ga-esi eme ma ọ bụrụ na onye ahụ na-ahụ gị. I kwuwe okwu, zere ịna-akwụsịtụ mgbe ọ na-adịghị mkpa. Ọ dịkwa mma ka gị na mmadụ mekọọ ya ọnụ. Onye ị na-ezi ozi ọma jụọ ajụjụ, kwughachi ya ka onye gị na ya nọ nụ ya ma nwee ike inyere gị aka ịchọta azịza ya

  • Jụọ ajụjụ ị ga-aza mgbe ọzọ unu ga-ekwu. Ọ bụrụ na onye ahụ nwere mmasị, jụọ ajụjụ ị ga-aza ma unu kwuwe mgbe ọzọ. I nwere ike ịgwa ya na ị ga-achọ isi n’iimel zitere ya otu akwụkwọ anyị ma ọ bụkwanụ jiri aka gị wegara ya ya. I nwekwara ike ịgwa ya na ị ga-achọ izitere ya otu n’ime vidio anyị ma ọ bụkwanụ zigara ya otu isiokwu. Mgbe ọ bụla ga-adaba adaba, gwa ya gbasara otu ihe dị na jw.org

^ par. 3 Ọ bụrụ na iwu obodo unu emegideghị isi n’ekwenti ezi mmadụ ozi ọma, onye ji ya ezi ozi ọma kwesịrị ime ya otú na-agaghị emegide ihe iwu kwuru gbasara ichekwa ihe mmadụ gwara gị banyere onwe ya.