Ihe Mere Ụmụ Izrel Ji Chụọ Àjà
N’Iwu Mozis, e nwere àjà ndị a gwara ụmụ Izrel ka ha na-achụ. Àjà ndị a mere Jehova obi ụtọ. E ji ha gosi àjà Jizọs ga-emecha jiri ndụ ya chụọ ma ọ bụ uru àjà ahụ ga-aba.—Hib. 8:3-5; 9:9; 10:5-10.
-
Anụmanụ niile a chọrọ ka ụmụ Izrel jiri chụọ àjà bụ nke ahụ́ dị mma. Otú ahụkwa ka Jizọs ji ahụ́ ya zuru okè, na-enweghịkwa mmehie ọ bụla chụọ àjà.—1 Pita 1:18, 19
-
A naghị ewepụ ihe ọ bụla n’anụmanụ e ji achụ àjà nsure ọkụ. A na-eji akụkụ ahụ́ ya niile chụọ àjà ahụ. Otú ahụkwa ka Jizọs ji obi ya niile nye Jehova onwe ya
-
Ọ bụrụ na mmadụ achụọ àjà udo, Jehova anabata ya, ya na Chineke na-adị ná mma. Otú ahụkwa ka ndị e tere mmanụ na-ata achịcha ma na-aṅụ mmanya Ncheta Ọnwụ Jizọs na Chineke dị ná mma