Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA | MEE KA OZI ỌMA NA-ATỌKWU GỊ ỤTỌ

Kụziere Ndị Ị Na-amụrụ Baịbụl Ịmụ Ihe n’Onwe Ha

Kụziere Ndị Ị Na-amụrụ Baịbụl Ịmụ Ihe n’Onwe Ha

Ihe ga-enyere ndị anyị na-amụrụ ihe aka ịmata Jehova nke ọma na ịghọ Ndị Kraịst tozuru etozu abụghị naanị eziokwu ndị anyị na-akụziri ha. (Mat. 5:3; Hib. 5:12–6:2) Kama, ha ga-amụtarịrị ịna-amụ ihe n’onwe ha.

Malite mgbe unu bidoro ịmụ ihe ọhụrụ gosiwe ndị ị na-amụrụ ihe otú ha ga-esi na-akwadebe ọmụmụ ihe ha, gbaakwa ha ume ịna-akwadebe ọmụmụ ihe nke ọ bụla. (mwb18.03 6) Gwa ha ka ha na-ekpe ekpere tupu ha amalite ịmụ ihe. Nyere ha aka inweta ihe ndị e ji amụ ihe na-adị n’ekwentị ma ọ bụ na kọmputa, kụziekwara ha otú e si eji ha amụ ihe. Mee ka ha mata otú ha ga-esi chọta ihe ọhụrụ gbara na jw.org ma ọ bụ n’ihe omume tiivi anyị. Jiri nwayọọ nwayọọ kụziere ha ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, ịkwadebe maka ọmụmụ ihe ọgbakọ, na ime nchọnchọ banyere ajụjụ ndị ha nwere. Nyekwara ha aka ịna-atụgharị uche n’ihe ndị ha na-amụta.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NYERE NDỊ Ị NA-AMỤRỤ BAỊBỤL AKA ỊNA-AMỤKWA IHE N’ONWE HA NA ỊNA-ELE VIDIO ANYỊ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee otú Linda si nyere Joy aka ịghọta na ihe dị n’ịmụ Baịbụl abụghị naanị ịza ajụjụ ndị a jụrụ?

  • Gịnị nyeere Joy aka ikweta na iwu Jehova nyere banyere izere mmekọahụ rụrụ arụ dị mma?

  • Kụziere ndị ị na-amụrụ ihe otú ha ga-esi na-amụ ihe na otú ha ga-esi na-eme ihe ha mụtara

    Gịnị ka Joy mechara ghọta banyere ichebara ihe ọ mụrụ echiche?