Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Anyị Na-ekele Jehova Maka Ịhụnanya Unu

Anyị Na-ekele Jehova Maka Ịhụnanya Unu

Ọgbakọ dị na Tesalonaịka gosiri Ndị Kraịst ibe ha na ha hụrụ ha n’anya n’agbanyeghị na ihe adịghịrị ha mfe. (2 Tesa. 1:​3, 4) Ndị Jehova na-egosikwa ụmụnna ha nọ n’ụwa niile otu ụdị ịhụnanya ahụ taa. Isiokwu ndị dị na jw.org n’ebe e dere “Ihe Ndị E Ji Onyinye I Nyere Eme” kwuru banyere ụzọ dị iche iche e sirila jiri onyinye ndị ị na-enye nyere ụmụnna gị aka n’oge ndị a ihe siri ike. Anyị na-aja unu mma maka ịhụnanya unu na mmesapụ aka unu.

LEENỤ VIDIO BỤ́ ANYỊ ‘NA-EKELE CHINEKE MGBE NIILE N’IHI UNU,’ ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

• Olee ihe ụfọdụ a na-eji onyinye ndị anyị na-enye eme?

• Olee ụzọ kacha mma anyị ga-esi jiri ego anyị na-enyere ụmụnna anyị ndị nọ ná mkpa aka?​—Gụọkwa isiokwu bụ́ “A Na-eji Ihe Mafọrọnụ Mejuo Ihe Kọrọ Ndị Ọzọ.” Ọ dị na jw.org