Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe Jekọb na-ebu amụma banyere ụmụ ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Otú Jehova Si Keere Ụmụ Izrel Ala Gosiri na Ọ Ma Ihe

Otú Jehova Si Keere Ụmụ Izrel Ala Gosiri na Ọ Ma Ihe

Jehova kwuru ka e fee nza. O nwere ike ịbụ ka e jiri ya mata ebe a ga-ekenye ebo nke ọ bụla ala (Josh. 18:10; it-1 359 ¶1)

Jehova mere ka amụma Jekọb buru mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ mezuo (Josh. 19:1; it-1 1200 ¶1)

Jehova hapụrụ ndị Izrel ka ha jiri aka ha kpebie otú ala a ga-ekenye ebo nke ọ bụla ga-eburu n’ibu (Josh. 19:9; it-1 359 ¶2)

E kere ala niile otú ọ na-agaghị akpata esemokwu ma ọ bụ mee ka otu ebo nwewara ebo ọzọ anyaụfụ. Olee otú ihe a si emesi gị obi ike banyere otú Jehova ga-esi hazie ihe n’ụwa ọhụrụ?