Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA | MEE KA OZI ỌMA NA-ATỌKWU GỊ ỤTỌ

Na-ekpe Ekpere ma Si Otú Ahụ Nabata Enyemaka Jehova

Na-ekpe Ekpere ma Si Otú Ahụ Nabata Enyemaka Jehova

Ọ bụ Jehova na-eme ka mkpụrụ nke eziokwu gbanye mgbọrọgwụ ma too n’obi mmadụ. (1 Kọr. 3:​6-9) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-eme nke ọma n’ozi ọma, anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi ka o nyere anyị na ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka.

Rịọ Jehova ka o nyere ndị ị na-amụrụ Baịbụl aka idi nsogbu ndị ha na-enwe, na imeri ihe ndị na-esiri ha ike. (Fil. 1:​9, 10) Kpọọrọ ya okwu aha. Rịọkwa ya ka o jiri mmụọ nsọ ya duzie echiche gị na ihe ndị ị na-eme iji nyere ha aka. (Luk 11:13) Kụziere ndị ị na-amụrụ Baịbụl otú e si ekpe ekpere, gbaakwa ha ume ka ha na-ekpe ekpere. Soro ha kpee ekpere, na-etinye ha na-ekpere nke gị, na-akpọkwa ha aha n’ekpere.

LEENỤ VIDIO BỤ́ NA-ENWE ỌṄỤ A NA-ENWE N’IHI IME NDỊ NA-ESO ỤZỌ​—NABATA AKA JEHOVA NA-ENYERE ANYỊ—EKPERE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee nsogbu Linda nwere n’ọmụmụ ihe ya na Joy?

  • Olee otú 1 Ndị Kọrịnt 3:6 si nyere Linda aka?

  • Olee otú Linda si merie nsogbu ahụ?