AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
Ndidi Jehova Agaghị Adịru Mgbe Ebighị Ebi
Jehova kwere ka ndị Asiria merie ndị Izrel (2 Eze 17:5, 6; it-2 908 ¶5)
Jehova tara ndị ya ahụhụ n’ihi na ha nọgidere na-eme ihe ndị na-adịghị mma n’anya ya (2 Eze 17:9-12; it-1 414-415)
Jehova nweere ndị Izrel ndidi ma dọọ ha aka ná ntị ugboro ugboro ka ha chegharịa (2 Eze 17:13, 14)
Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya na-enwere ụmụ mmadụ na-ezughị okè ezigbo ndidi. (2 Pita 3:9) Ma iji mezuo uche ya, ọ ga-ebibi ndị ajọ omume n’oge na-adịghị anya. Olee otú ihe a ga-esi nyere anyị aka ịnabata ndụmọdụ a na-enye anyị, jirikwa ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma?