OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Nwee Obi Ike na A Ga-echebe Anyị n’Ụbọchị Ikpeazụ
N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-akwụsị inwere ụmụ mmadụ ndidi. A ga-ebibi okpukpe ụgha, mba ndị jikọtara aka ọnụ ga-alụso ndị Chineke ọgụ, Jehova ga-ebibikwa ndị ọjọọ niile n’Amagedọn. Ndị Kraịst na-atụsi anya ike mgbe ihe ndị a dị ezigbo mkpa ga-eme.
Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị amachaghị ihe niile ga-eme n’oge oké mkpagbu. Dị ka ihe atụ, anyị amaghị kpọmkwem mgbe ọ ga-amalite. Anyị amaghị ihe ndị ọchịchị ga-akụdo aka lụso ndị okpukpe ọgụ. Anyị amaghị ogologo oge ọgụ a mba ndị jikọtara aka ọnụ ga-alụso ndị Chineke ga-ewe ma ọ bụ otú ha ga-esi alụso ha ọgụ ahụ. Anyị amaghịkwa kpọmkwem ihe Jehova ga-eji ebibi ndị ọjọọ n’Amagedọn.
Ma, Baịbụl na-agwa anyị ihe niile anyị ga-eme ka ụjọ ghara ịna-atụ anyị maka ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, anyị ma na anyị nọzi ná ngwụcha “oge ikpeazụ.” (2 Tim. 3:1) Anyị ma na a ga-eme ka oge ndị ọchịchị ga-eji ebibi ndị okpukpe “dị mkpirikpi” ka ha ghara ibibi ndị na-ekpe ezi okpukpe. (Mat. 24:22) Anyị ma na Jehova ga-anapụta ndị ya. (2 Pita 2:9) Anyị makwa na Onye Chineke nyere ọrụ ibibi ndị ọjọọ na ịzọpụta oké ìgwè mmadụ n’agha Amagedọn na-eme ihe kwesịrị ekwesị ma dị ike.—Mkpu. 19:11, 15, 16.
N’eziokwu, ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu ga-eme ka ndị mmadụ ‘tụbọọ n’ihi egwu.’ Ma, anyị cheta otú Jehova si chebe ndị ohu ya n’oge ochie nakwa otú o kwuru ọ ga-esi echebe anyị n’ọdịnihu, anyị ‘ga-eguzoro kwem, weliekwa isi anyị elu, n’ihi na oge Chineke ga-anapụta anyị eruola nso.’—Luk 21:26, 28.