OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Na-aṅụrị Ọṅụ Mgbe A Na-akpagbu Gị
Ndị Kraịst kwesịrị ịtụ anya na a ga-akpagbu ha. (Jọn 15:20) Ọ bụ eziokwu na mkpagbu na-eme ka anyị na-echegbu onwe anyị, na-atakwa ahụhụ mgbe ụfọdụ, ma idi ya ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ.—Mat. 5:10-12; 1 Pita 2:19, 20.
LEENỤ VIDIO BỤ́ ANYỊ NWERE IKE ỊNA-AṄỤRỊ ỌṄỤ N’AGBANYEGHỊ MKPAGBU, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Nwanna Bazhenov banyere uru ọ bara
-
ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị?
-
ụmụnna anyị inyere anyị aka? a
-
ikpechi ekpere anya?
-
ịgụ abụ Alaeze?
-
ikwu banyere ihe ndị anyị kweere?
a Anyị nwere ike ikpe ekpere maka ụmụnna anyị nọ n’ụlọ mkpọrọ, anyị nwedịrị ike ịkpọ ha aha n’ekpere anyị. Ma, ọ gaghị adịrị alaka ụlọ ọrụ mfe izigara ha akwụkwọ ozi anyị deere ha.