Disemba 26, 2022–Jenụwarị 1, 2023
2 NDỊ EZE 20-21
Abụ nke 41 na Ekpere
Okwu Mmeghe (1 nkeji)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Jehova Nyeere Hezekaya Aka n’Ihi Ekpere O Kpere”: (Nkeji 10)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 10)
2 Eze 21:13—Olee otú Jehova ga-esi jiri ihe e ji atụ̀ ihe iji mata ma ihe ọ̀ dị larịị tụọ Jeruselem? (it-2 240 ¶1)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova, ozi anyị, ma ọ bụ ihe ọzọ?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4) 2 Eze 21:1-15 (th ihe ọmụmụ nke 10)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 3) Jiri isiokwu a na-ekwu gbasara ya n’Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta malite. Zie ya ozi ọma n’agbanyeghị na o kwuru ihe ndị na-achọghị ịnụ ozi ọma na-ekwukarị. (th ihe ọmụmụ nke 4)
Nletaghachi: (Nkeji 4) Jiri isiokwu a na-ekwu gbasara ya n’Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta malite. Gwa ya banyere ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, nyekwa ya kaadị jw.org. (th ihe ọmụmụ nke 6)
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 5) lff isi nke 08 nọmba nke 6 (th ihe ọmụmụ nke 19)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Jehova Ji Ekpere Anyị Kpọrọ Ihe”: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio bụ́ Ejighị M Ekpere Egwu Egwu.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) lff isi nke 32 nọmba nke 5-6 na nchịkọta, ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ, na ihe ị ga-agba mbọ mee
Okwu Mmechi (Nkeji 3)
Abụ nke 142 na Ekpere