Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Jehova Ji Ekpere Anyị Kpọrọ Ihe

Jehova Ji Ekpere Anyị Kpọrọ Ihe

Ekpere ndị Jehova na-aza dị ka insens na-esi ísì ọma a na-eji achụrụ ya àjà mgbe niile n’ụlọ nsọ. (Ọma 141:2) Anyị gwa Nna anyị nke eluigwe otú anyị si hụ ya n’anya ma kelee ya, gwa ya ihe ndị na-echegbu anyị na ihe ndị anyị chọrọ, rịọkwa ya ka ọ na-eduzi anyị, ọ na-egosi na anyị ji adịm ná mma anyị na ya kpọrọ ihe. N’eziokwu, Jehova na-ewere nkenke ekpere ndị a na-ekpe ma anyị gaa ọmụmụ ihe ka ihe dị ezigbo mkpa n’ofufe anyị na-efe ya. Ma, ọ na-atọgbu Jehova atọgbu ma anyị wepụta oge buru ibu kọọrọ ya obi anyị mgbe anyị na-ekpe ekpere nke anyị.—Ilu 15:8.

LEENỤ VIDIO BỤ́ EJIGHỊ M EKPERE EGWU EGWU, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee ọrụ ndị Nwanna Johnson rụrụla n’ọgbakọ?

  • Olee otú Nwanna Johnson si ekpe ekpere nke gosiri na ọ tụkwasịrị Jehova obi?

  • Olee ihe ndị ị mụtara n’akụkọ Nwanna Johnson?