OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Jehova Na-echeta Mbọ Anyị Na-agba n’Ozi Ya
Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị anyị ka ndị mmadụ ejighị ihe ọma anyị meere ha kpọrọ ihe nakwa na ha na-echefu ya ngwa ngwa. Ma, olee otú Jehova si were ozi anyị na-ejere ya? O ji ya kpọrọ ihe, ọ naghịkwa echefu ozi anyị ji obi anyị niile na-ejere ya. Ọ bụrụgodị na ọrịa emeela ka anyị gharazie ịna-eme ihe ndị anyị na-emebu n’ozi ya, ọ gaghị agbahapụ anyị.—Hib. 6:10.
LEENỤ VIDIO BỤ́ JEHOVA NA-ECHETA OZI ANYỊ JEERE YA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
Olee ụzọ dị iche iche Nwanna Hibshman si gbasie mbọ ike n’ozi Jehova?
-
Olee otú Jehova si gosi na ọ na-echeta Nwanna Hibshman mgbe nwunye ya nwụchara nakwa mgbe nká mere ka ọ gharazie ịna-emeli ihe ụfọdụ ọ na-emebu?
-
Olee otú ozi oge niile Nwanna Hibshman jere si mee ka ọ bụrụ ọgaranya n’ebe Jehova nọ?—Ilu 10:22