OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ihe Ga-enyere Anyị Aka Ịghara Ịna-eyigharị Ihe Anyị Chọrọ Ime
Onye na-eyigharị ihe ọ chọrọ ime anaghị eme ihe o kwesịrị ime ozugbo. Ọ na-ebugakarị ya oge ọzọ. Mgbe Jehova gwara Jihu ka o gbuo ndị ezinụlọ Ehab, Jihu eyigharịghị ya. (2 Eze 9:6, 7, 16) Ụfọdụ ndị na-ekwu, sị: “M nwere ike ime baptizim n’afọ ole na ole na-abịa abịa.” “N’oge na-adịghị anya, m ga-amalite gụwa Baịbụl kwa ụbọchị.” “M ga-amalite ịsụ ụzọ ozugbo m nwetara ezigbo ọrụ.” Baịbụl ga-enyere anyị aka ịghara ịna-eyigharị ihe ndị anyị kwesịrị ime n’ofufe Chineke.
Olee otú amaokwu Baịbụl ndị a nwere ike isi nyere anyị aka ịghara ịna-eyigharị ihe anyị chọrọ ime?