Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Gịnị Mere Ndị Kraịst Ga-eji Gbalịa Ruo Eruo Ijekwuru Jehova Ozi?

Gịnị Mere Ndị Kraịst Ga-eji Gbalịa Ruo Eruo Ijekwuru Jehova Ozi?

Ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị na-agbasi mbọ ike iji ruo eruo ijekwuru Jehova ozi, dị ka ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ, ije ozi na Betel, na iso na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ụmụnna nwoke na-agbalịkwa iru eru ịbụ ndị nlekọta. (1 Tim. 3:1) Ihe a ọ̀ pụtara na Ndị Kraịst kwesịrị ịna-achọsi ike ịbụ ndị nlekọta ma ọ bụ ndị na-arụ ọrụ pụrụ iche ka e nwee ike ịna-ele ha anya ka ndị ukwu ma ọ bụ ndị ọkwá ha gbagotere?

LEENỤ VIDIO BỤ́ IHE MERE ANYỊ GA-EJI GBALỊA RUO ERUO IJEKWURU JEHOVA OZI (1 TIM. 3:1), ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

Olee otú amaokwu Baịbụl ndị a ga-esi nyere anyị aka ịmata ihe atọ mere anyị kwesịrị iji gbalịa ruo eruo ijekwuru Jehova ozi?