AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“M Ga-ala Ndị Ezinụlọ Ehab n’Iyi”—2 Eze 9:8
ALAEZE JUDA
Jehoshafat bụ eze
Ihe dị ka n’afọ 911: Jehoram (nwa Jehoshafat; di Atalaya; Atalaya bụ nwa Ehab na Jezibel) chịwaziri naanị ya
Ihe dị ka n’afọ 906: Ehazaya (nwa nwa Ehab na Jezibel) ghọrọ eze
Ihe dị ka n’afọ 905: Atalaya gburu ụmụ eze niile ma weghara ọchịchị n’ike. Naanị nwa nwa ya bụ́ Jehoash ka Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Jehoyada zonahụrụ ya ma chebe.—2 Eze 11:1-3
898: Jehoash ghọrọ eze. Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Jehoyada gburu Eze Nwaanyị ahụ bụ́ Atalaya.—2 Eze 11:4-16
ALAEZE IZREL
Ihe dị ka n’afọ 920: Ehazaya (nwa Ehab na Jezibel) ghọrọ eze
Ihe dị ka n’afọ 917: Jehoram (nwa Ehab na Jezibel) ghọrọ eze
Ihe dị ka n’afọ 905: Jihu gburu eze Izrel bụ́ Jehoram na ụmụnne ya, gbuo nne Jehoram (bụ́ Jezibel), gbuokwa eze Juda bụ́ Ehazaya na ụmụnne ya.—2 Eze 9:14–10:17
Ihe dị ka n’afọ 904: Jihu malitere ịchị dị ka eze