OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Na-enyenụ Ihe”
Jizọs kwuru na ọ bụrụ na anyị ana-emesapụ aka, ọ ga-eme ka ndị ọzọ na-emesapụkwa aka. (Luk 6:38) Ọ bụrụ na anyị ana-emesapụ aka mgbe niile, ọ ga-eme ka ụmụnna anyị na-emekwa otú ahụ.
Iji obi ụtọ na-enye onyinye so n’ofufe anyị na-efe Jehova. Jehova na-ahụ ndị niile ji obi ha na-enye ụmụnna ha nọ ná mkpa ihe. O kwekwara nkwa na ọ ga-akwụ ha ụgwọ.—Ilu 19:17.
LEENỤ VIDIO BỤ́ ANYỊ NA-EKELE UNU MAKA OTÚ UNU SI EMESAPỤ AKA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
-
Olee otú e sirila jiri onyinye ndị i nyere nyere ụmụnna gị aka?
-
Gịnị mere anyị kwesịrị iji nọgide na-enye ihe n’agbanyeghị otú ihe anyị na-enye hà?—Gụọkwa isiokwu bụ́: “A Na-eji Ihe Mafọrọnụ Mejuo Ihe Kọrọ Ndị Ọzọ.” Ọ dị na jw.org.