Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe Ịlaịsha na-agwa onye na-ejere ya ozi, sị: “Ndị anyị na ha nọ karịrị ndị ha na ha nọ.”—2 Eze 6:16

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Ndị Anyị na Ha Nọ Karịrị Ndị Ha na Ha Nọ

Ndị Anyị na Ha Nọ Karịrị Ndị Ha na Ha Nọ

Ndị iro gbara Ịlaịsha na onye na-ejere ya ozi gburugburu (2 Eze 6:13, 14; it-1 716 ¶4)

Ụjọ atụghị Ịlaịsha. O mekwara ka okwukwe onye na-ejere ya ozi sie ike (2 Eze 6:15-17; w13 8/15 30 ¶2; lee ihe e sere n’ihu akwụkwọ a)

Jehova rụrụ ọrụ ebube napụta Ịlaịsha na onye na-ejere ya ozi (2 Eze 6:18, 19; it-1 343 ¶1)

Ndị na-emegide anyị akaghị Jehova ike. Ọ bụrụ na anyị ga-ahụli ihe na-eme n’eluigwe ma hụ otú Jehova si eji ndị mmụọ ozi echebe anyị, gịnị ka i chere na anyị ga-ahụ?