Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Ihe Anyị Na-eche Si Gbasa Ijisi Chineke Aka Ike

Otú Ihe Anyị Na-eche Si Gbasa Ijisi Chineke Aka Ike

Anyị na-esi n’okwu ọnụ anyị na n’omume anyị egosi na anyị jisiri Chineke aka ike. Ma, anyị na-esikwa n’ihe anyị na-eche n’echiche egosi ya. (Ọma 19:14) N’ihi ya, Baịbụl gbara anyị ume ka ihe anyị na-eche bụrụ ihe ọ bụla bụ́ eziokwu, ihe dị ezigbo mkpa, ihe ziri ezi, ihe dị ọcha, ihe na-eme ka mmadụ hụ ibe ya n’anya, ihe a na-ekwu okwu ọma banyere ya, ihe bụ́ omume ọma, na ihe kwesịrị otuto. (Fil. 4:8) N’eziokwu, anyị enweghị ike ime ka ihe ọjọọ ghara ịbatatụ anyị n’obi. Ma, ijide onwe anyị ga-enyere anyị aka iwepụ echiche ọjọọ n’obi anyị ma were nke dị mma dochie ya. Ọ bụrụ na anyị ana-eche ihe ndị dị mma n’echiche, ọ ga-enyere anyị aka ịna-eme ihe ndị dị mma.​—Mak 7:​21-23.

N’okpuru amaokwu ndị a, dee ụdị ihe anyị na-ekwesịghị ịna-eche n’echiche:

Rom 12:3

Luk 12:15

Mat. 5:28

Fil. 3:13