Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ihe Ndị M Ga Na-eme Ka Ndị Jehova Nọgide Na-enwe Aha Ọma

Ihe Ndị M Ga Na-eme Ka Ndị Jehova Nọgide Na-enwe Aha Ọma

Ndị mmadụ na-ahụ àgwà Ndịàmà Jehova na-akpa. (1 Kọr. 4:9) Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị, ‘Okwu ọnụ m na omume m hà na-eme ka e too Jehova?’ (1 Pita 2:12) N’eziokwu, anyị ekwesịghị ime ihe ọ bụla ga-emebi aha ọma Ndịàmà Jehova meere onwe ha kemgbe ọtụtụ afọ.​—Ekli. 10:1.

Ọ bụrụ na ihe ndị a e dere n’okpuru ebe a emee, dee ihe Onye Kraịst kwesịrị ime na ihe e kwuru na Baịbụl ga-enyere ya aka:

  • Onye na-abụghị Onyeàmà Jehova ji iwe kparịa gị

  • Uwe gị, ụgbọala gị, ma ọ bụ ụlọ gị adịghị ọcha

  • O yiri ka iwu e tiri n’obodo unu bụ iji megbute ụfọdụ ndị ma ọ bụkwanụ na idebe ya siri ike

Olee otú ndị na-eme nchọnchọ ná Ngalaba Ide Ihe si eme ka Ndị Jehova nọgide na-enwe aha ọma?

LEENỤ VIDIO BỤ́ IME KA A HỤ EZIOKWU N’ANYA MA JIRI YA KPỌRỌ IHE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ A:

Gịnị masịrị gị ná mbọ nzukọ Jehova na-agba iji dee ihe bụ́ eziokwu?